Ihe Ndị Ị Ga-eme na Ihe Ndị Ị Na-agaghị Eme
Anyị Na-anabata Gị!
E mepere jw.org ka o nyere gị aka ịmụtakwu gbasara Chineke, Baịbụl, na Ndịàmà Jehova. N’ihe ndị dị ebe a, gụọ, kirie, ma ọ bụ danloduo nke ọ bụla dị gị mma. Anyị chọrọ ka jw.org bakwaara ndị ọzọ. Ma, biko ewerela ihe dị na ya gaa tinye n’ebe ndị na-edewe ihe n’Ịntanet. I nwere ike ịgwa ndị ọzọ ihe ị mụtara na jw.org. Otú i nwere ike isi eme ya bụ ịgwa ha ka ha gaa na ya otú ahụ e kwuru ya n’okpuru ebe a.
- Ikike Ịgbanwe Ihe
- Ihe Ụlọ Ọrụ Nwe
- Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme Nakwa Ikike I Nwere Ịbanye na Jw.org
- Ihe Gbasara Ọrịa
- Ihe Ndị Aka Anyị Na-adịghị na Ha
- Ịda Iwu Gbasara Ihe Ndị Ị Ga-eme na Ihe Ndị Ị Na-agaghị Eme
- Ịgbanwe Ihe
- Ihe Gbasara Iwu
- Ihe Ga-eme ma A Kagbuo Ihe Ụfọdụ
- Nkwekọrịta A Niile
Ikike Ịgbanwe Ihe
© 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, Inc. All rights reserved. Ọ bụ Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc (“Watchtower”) nwe Jw.org. Ọ bụkwa ha na-elekọta ya. Ọ gwụkwala ma è dere aha ndị ọzọ, ọ bụ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania (“Watch Tower”) nwe ihe niile dị na Jw.org.
Ihe Ụlọ Ọrụ Nwe
Ọ bụ ndị Adobe Systems Incorporated nwe akara e ji mara Adobe, Acrobat, na akara e ji mara Acrobat. Ọ bụ ndị Apple Inc. nwe iTunes na iPod. Ọ bụkwa ndị Microsoft Inc. nwe Microsoft, akara e ji mara Microsoft, na aha ihe ọ bụla ọzọ ndị Microsoft mepụtara, ma Microsoft Office ma Microsoft Office 365. E nwee ihe ọ bụla ọzọ ụlọ ọrụ ndị ọzọ nwe, anyị ga-edekwa aha ihe ahụ na ndị nwe ha nakwa akara e ji mara ha.
Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme Nakwa Ikike I Nwere Ịbanye na Jw.org
Iwu ndị e nyere ebe a bụ ihe ị ga-eme na ihe ị na-agaghị eme na jw.org. Ị banye n’akaụnt gị mee ihe ọ bụla na ya, ọ pụtara na i kwetara ihe niile e kwuru n’Ihe Ndị Ị Ga-eme na Ihe Ndị Ị Na-agaghị Eme na jw.org. Ọ bụrụ na e nwere nke ị na-ekwetaghị n’ime ihe ndị a, ejikwala jw.org eme ihe ọ bụla. Olee ihe ndị ị na-ekwesịghị ime na jw.org? N’ihi ihe ndị a machibidoro iwu n’okpuru ebe a, i nwere ike:
- Isi na kọmputa gị mepee ihe Watch Tower sere, akwụkwọ ha, egwú ha, foto, ihe ha dere ma ọ bụ vidio. I nwekwara ike ịdanlodu nke ọ bụla, gụọ ya ma ọ bụ lee ya. Ma ejila ya achụ nta ego.
- Izigara onye ọzọ ihe i si na jw.org danloduo, ma ọ̀ bụ vidio ma ọ bụ ihe a na-egere egere, ma ọ bụkwanụ gị ezigara onye ahụ ebe ọ ga-esi mepee ya na jw.org.
I kwesịghị:
- Itinye ihe ị danloduru na jw.org n’Ịntanet ma ọ bụ n’ihe yiri ya, bụ́ ebe ndị mmadụ na-anọ ekerịta ihe ha danloduru. Ihe ahụ nwere ike ịbụ akwụkwọ, akara e ji mara jw.org, egwú, foto, vidio ma ọ bụ ihe e dere ede.
- Itinye ihe e sere ese, akwụkwọ, akara e ji mara jw.org, egwú, foto, ihe e dere ede, ma ọ bụ vidio si na jw.org ná ngwá ọrụ ọ bụla a na-etinye na kọmputa ma zigara ya onye ọzọ.
- Isegharị ihe e sere na jw.org ma ọ bụ mepụtaghachi akwụkwọ, akara e ji mara jw.org, egwú, foto, ihe e dere ede, ma ọ bụ vidio ma zigara ya onye ọzọ ka o jiri chụọ nta ego.
- Imepụta ngwá ọrụ kọmputa ọ bụla a rụrụ ka o nwee ike iwere ihe ọ bụla dị na jw.org na-arụ ọrụ. (Ọ pụtaghị na ị gaghị ezigara ndị ọzọ ihe ga-enyere ha aka ịdanlodu ihe dị na jw.org, dị ka EPUB, PDF, MP3, and MP4.)
- Iji jw.org na-eme ihe ị na-ekwesịghị ime, dị ka ịbanye n’ebe ị na-ekwesịghị ịbanye ma ọ bụ isi n’ụzọ ọzọ na-abụghị ihe e kwuru ebe a banye na ya.
- Iji jw.org eme ihe ọ bụla nwere ike ịkpata nsogbu ma ọ bụ mebie ihe dị na jw.org ma ọ bụkwanụ mee ka ndị na-abanye na ya ghara inwe ike ime otú ahụ, ma ọ bụ si na ya gwuo wayo ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ bụ́ ịda iwu.
- Iji jw.org ma ọ bụ ihe e sere na ya, akwụkwọ dị na ya, egwú, foto, ihe e dere ede ma ọ bụ vidio mee ihe ọ bụla gbasara ịzụ ahịa.
Ihe Gbasara Ọrịa
Ihe e kwuru ebe a bụ naanị iji mee ka ị mata ihe ụfọdụ. Anyị anaghị agwa gị ihe ị ga-eme ma ị rịawa ọrịa ma ọ bụ gwawa gị mee nke a na nke ọzọ kama ịga hụ dọkịta ma ọ bụ gawa ụlọ ọgwụ. Anyị agaghị agwa gị otú a ga-esi lee gị ahụ́, ụdị ndị dọkịta ị ga-aga hụ, ụdị ọgwụ ị ga-aṅụ, ma ọ bụ otú a ga-esi gwọọ gị ọrịa. I nwee ajụjụ ọ bụla gbasara ọrịa ma ọ bụ otú e si agwọ ya, gaa hụ dọkịta ka ọ kọwaara gị ihe ọ bụla ị chọrọ ịma. A na-agbalịsi ike ka ihe e tinyere ebe a bụrụ eziokwu na ihe dabara adaba n’ihe a na-ekwu ugbu a gbasara ọrịa. Ma, anyị anaghị ekwe gị nkwa ọ bụla pụrụ iche gbasara ya. Ihe anyị na-ekwu ebe a bụ na aka anyị adịghị n’ikwe ụdị nkwa ahụ ma ọ bụ ikwu na ihe ọ bụla e kwuru ebe a ga-adabarịrị adaba mgbe niile. Jw.org anaghị ekwe gị nkwa na a gaghị agbanwe ihe e kwuru na ya gbasara ọrịa, ma ọ bụ na ọ ga-aba uru mgbe niile ma ọ bụkwanụ na ọ bụ o kwuchaa o bie n’ihe gbasara ọrịa. Anyị anaghị ekwe gị nkwa na anyị agaghị edehie ihe ọ bụla ma ọ bụ na anyị ga-ederịrị ihe niile ị chọrọ ka e dee. I mee ihe e kwuru ebe a gbasara ọrịa, ị ga-eji isi gị buru ihe ọ bụla si na ya pụta. O nweghị mgbe ị ga-agbawa jw.org akwụkwọ maka ihe ọ bụla si na ya pụta. Ị gaghịkwa asị anyị kwụọ gị ụgwọ ego ọ bụla i mefuru ma ọ bụ nke funahụrụ gị, ma ọ bụkwanụ maka ọnwụ mberede ma ọ bụ ihe ọghọm, ma ihe ahụ ọ̀ bụ n’ihi na i mere ihe e kwuru ebe a gbasara ọrịa ma ọ bụ na i meghị ya, ma ọ bụkwanụ maka nkwa e kwere gị, ihe e kwesịrị ime nke a na-emeghị, ma à gwara anyị gbasara ya ma ọ bụ na a gwaghị anyị.
Ihe Ndị Aka Anyị Na-adịghị na Ha
Ọ bụ Watchtower wepụtara ihe niile dị na jw.org otú a e si dee ya. Anyị anaghị ekwe gị nkwa na ọ ga-adịrịrị otú ị chọrọ. Anyị anaghị ekwe gị nkwa na vaịrọs ma ọ bụ ihe ọzọ na-emebi ihe agaghị abata na ya. Aka anyị adịghị n’ihe ọ bụla mebirinụ n’ihi ihe i ji jw.org ma ọ bụ ihe dị na ya mee ma ọ bụ n’ihi iji ya mee ihe ị na-ekwesịghị ime, ya akpatara gị nsogbu ma ọ bụ mee ka ego funahụ gị.
Ịda Iwu Gbasara Ihe Ndị Ị Ga-eme na Ihe Ndị Ị Na-agaghị Eme
I mee otu n’ime ihe ndị a Watchtower kwuru na ọ bụ ịda iwu, Watchtower nwere ike ime ihe ọ bụla ha ga-emeli n’agbanweghị ikike ndị ọzọ ha nwere. Ha nwere ike ịnapụ gị ikike i ji abanye n’akaụnt gị, mee ka ị ghara inwe ike imepe jw.org. Ha nwekwara ike ịgwa ndị na-ahụ maka Ịntanet gị ka ha ghara ikwe gị mepee jw.org. Ha nwekwara ike ịgba gị akwụkwọ maka ya.
Ịgbanwe Ihe
Watchtower nwere ike ịgbanwe ihe e kwuru ebe a mgbe ụfọdụ. A gbanwechaa ya, ụbọchị ọ bụla ị banyere n’akaụnt gị, ọ pụtara na i kwetara n’ihe ndị ahụ a gbanwere. Biko, na-aga na ya mgbe niile ka ị mara mgbe a gbanwere ma ọ bụ tinye ọhụrụ n’ihe e kwuru gbasara ya ebe a.
Ihe Gbasara Iwu
Ihe ndị e kwuru gbasara ha ebe a gbasara iwu steeti Niu Yọk dị n’Amerịka, ọ bụrụgodị na o megidere iwu obodo ndị ọzọ. A gbaa akwụkwọ gbasara ya, a ga-ekpe ya n’ụlọikpe steeti ma ọ bụ nke ọchịchị etiti dị na steeti Niu Yọk dị n’Amerịka.
Ihe Ga-eme ma A Kagbuo Ihe Ụfọdụ
Ọ bụrụ na ụlọikpe akagbuo otu n’ime ihe ndị e kwuru ebe a, ọ pụtaghị na ọ kagbuola ha niile. Ndị nke ọzọ ka ga-adịkwa. Ọ bụrụ na Watchtower emeghị ihe ọ bụla gbasara ya, ọ pụtaghị na ha enweghịzi ikike ime otú ahụ.
Nkwekọrịta Niile Gị na Watchtower Nwere
Ihe ndị e kwuru n’Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme bụ nkwekọrịta niile gị na Watchtower nwere n’ihe gbasara ihe i kwesịrị ime na jw.org. E ji ya dochie ihe ọ bụla ọzọ e kwuburu gbasara ya na jw.org. Lee ihe Additional Terms of Use gbasara otú i si abanye n’akaụnt gị.